15 Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha wee na-ezigara ha ndị ozi ya+ ka ha dọọ ha aka ná ntị, o zigara ha ugboro ugboro, n’ihi na o nweere ndị ya ọmịiko,+ nweekwa ọmịiko maka ebe obibi ya.+
13 Ebe ọ bụ na unu nọ na-eme ihe ndị a,’ ka Jehova kwuru, ‘mụ onwe m wee na-agwa unu okwu, na-ebili n’isi ụtụtụ na-agwa unu okwu,+ ma unu egeghị ntị,+ m nọkwa na-akpọ unu òkù, ma unu azaghị,+
7 N’ihi na m dụsiri nna nna unu hà ọdụ ike n’ụbọchị m si n’ala Ijipt+ kpọpụta ha ọbụna ruo taa, na-ebili n’isi ụtụtụ na-adụ ha ọdụ, sị: “Rubenụ isi n’ihe m kwuru.”+
10 Ndị ọjọọ a, ndị na-ajụ irube isi n’okwu m,+ ndị na-eje ije dị ka isi ike nke dị n’obi ha si dị,+ na-esokwa chi ọzọ dị iche iche iji na-efe ha ofufe ma na-akpọrọ ha isiala,+ ga-adị nnọọ ka ájị̀ ahụ ọ na-adịghị ihe a ga-eji ya eme.’
12 Unu onwe unu emewokwa omume ọjọọ karịa nna unu hà,+ lee, onye ọ bụla n’ime unu na-eje ije dị ka isi ike+ nke dị n’ajọ obi ya si dị wee ghara irubere m isi.+