21 Devid wee sị Maịkal: “Ọ bụ n’ihu Jehova, bụ́ onye họọrọ m kama ịhọrọ nna gị na ezinụlọ ya wee mee ka m bụrụ onye ndú+ nke ndị Jehova bụ́ Izrel ka m nọ na-enwe obi ụtọ, m ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihu Jehova.+
21 Ọ na-agbanwekwa oge na mgbe a kara aka,+ na-ewepụ ndị eze, na-emekwa ka ndị eze malite ịchị,+ na-enye ndị maara ihe amamihe, na-enyekwa ndị nwere nghọta ihe ọmụma.+
17 Ọ bụ ndị nche+ nyere iwu a; ọ bụkwa ndị nsọ kwuru ka e mee ihe a; ka ndị dị ndụ wee mara na Onye Kasị Elu bụ Onye Na-achị Achị n’alaeze ụmụ mmadụ,+ ọ bụkwa onye ọ chọrọ inye ya ka ọ na-enye ya,+ ọ na-emekwa ka onye kasị ala n’etiti ụmụ mmadụ na-achị ya.”+