18 Ị ga-echeta Jehova bụ́ Chineke gị, n’ihi na ọ bụ ya na-enye gị ike i ji akpata akụ̀;+ ka o wee debe ọgbụgba ndụ ya nke ọ ṅụụrụ nna nna gị hà n’iyi, dị ka ọ dị taa.+
12 m ga-enye gị amamihe na ihe ọmụma;+ m ga-enyekwa gị akụnụba na nsọpụrụ n’ókè ọ na-enweghị ndị eze bu gị ụzọ nwere ya+ nakwa n’ókè ọ na-enweghị onye ga-enwe ya mgbe ị nwụsịrị.”+
12 Jehova wee gọzie+ ikpeazụ Job karịa mmalite ya,+ o wee nwee atụrụ dị puku iri na anọ na kamel dị puku isii na puku ehi abụọ e jikọrọ abụọ abụọ nakwa otu puku nne ịnyịnya ibu.