26 “‘N’ihi na a hụwo ndị ajọ omume n’etiti ndị m.+ Ha na-enyogharị anya, dị ka mgbe ndị na-achụ nta nnụnụ hulatara ala.+ Ha esiwo ọnyà nke na-ebibi ihe. Ọ bụ mmadụ ka ha na-amata n’ọnyà.
15 O jiriwo nko azụ̀ dọpụta ha niile;+ ọ na-eji ụgbụ ya adọkpụrụ ha, ọ na-achịkọtakwa ha n’ụgbụ o ji akụ azụ̀.+ Ọ bụ ya mere o ji na-aṅụrị ọṅụ ma na-enwe obi ụtọ.+
12 Onye e goro ọrụ+ nke na-abụghị onye ọzụzụ atụrụ, onye atụrụ na-abụghịkwa nke ya, na-ahụ anụ ọhịa wolf ka ọ na-abịa, ya ahapụ atụrụ ahụ gbaa ọsọ—anụ ọhịa wolf na-akpụrụ ha ma chụsasịa ha+—