7 “Cheta: Echefula otú i si kpasuo Jehova bụ́ Chineke gị iwe n’ala ịkpa.+ Malite n’ụbọchị i si n’ala Ijipt pụọ ruo mgbe unu bịarutere ebe a, unu anọwo na-enupụrụ Jehova isi site n’àgwà unu na-akpaso ya.+
27 “Ya mere, gwa ụlọ Izrel okwu, gị nwa nke mmadụ, sị ha,+ ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Ma, nna nna unu hà kparịrị m n’ihe a, ya bụ, n’omume ekwesịghị ntụkwasị obi ha mesoro m.+