9 N’ihi na anya+ Jehova na-ahụzu ụwa dum+ iji gosi ike ya maka ndị obi ha+ zuru ezu n’ebe ọ nọ. I zuzuru nzuzu+ n’ihe a i mere, n’ihi ya, malite ugbu a gaa n’ihu, a ga na-ebuso gị agha.”+
6 Ọ bụrụkwa na okwukwe adịghị,+ ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị ya ezi mma,+ n’ihi na onye na-abịaru Chineke nso aghaghị ikwere na ọ dị adị,+ na ọ bụkwa onye na-akwụ ndị na-achọsi ya ike+ ụgwọ ọrụ.+