4 Ọ bụrụ na i jee ije+ n’ihu m, dị nnọọ ka Devid+ nna gị jere, n’obi na-eguzosi ike n’ezi ihe+ nakwa n’izi ezi+ site n’ime ihe niile m nyere gị n’iwu+ ma debe ụkpụrụ+ m na mkpebi ikpe m,+
4 O wee ruo mgbe Sọlọmọn na-eme agadi+ na ndị nwunye ya mere ka obi ya chigharịa+ soro chi ọzọ dị iche iche;+ obi ya dum adịghịkwa+ n’ebe Jehova bụ́ Chineke ya nọ dị ka obi Devid nna ya dịrị.
3 sị: “Ana m arịọ gị arịrịọ, Jehova, biko, cheta+ otú m si jiri eziokwu+ na obi zuru ezu+ jee ije+ n’ihu gị, ọ bụkwa ihe dị mma n’anya gị ka m mere.” Hezekaya wee malite ịkwasi ákwá ike.+