22 M wee gwa ndị Livaị+ na ha ga na-eme onwe ha ka ha dị ọcha+ mgbe niile, na-abatakwa, na-eche ọnụ ụzọ ámá nche+ iji doo ụbọchị izu ike nsọ.+ Chineke m, biko, chetakwa+ nke a iji meere m ihe ọma, meekwara m ebere dị ka obiọma+ gị si dị ukwuu.
58 Ya mere, ụmụnna m m hụrụ n’anya, guzosienụ ike,+ bụrụnụ ndị kwụ chịm, ndị nwere ọtụtụ ihe ha na-arụ mgbe niile n’ọrụ Onyenwe anyị,+ ebe unu maara na ndọgbu unu na-adọgbu onwe unu n’ọrụ abụghị n’efu+ n’ime Onyenwe anyị.