Abụ Ọma 31:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 Aghọwo m onye a na-akọcha+ n’anya ndị niile na-ebuso m iro,+Otú ahụkwa ka m dị n’anya ndị agbata obi m,+Abụkwa m onye ndị mụ na ha ma na-atụ ụjọ.+Mgbe ha hụrụ m n’èzí, ha na-agbara m ọsọ.+ Abụ Ọma 42:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 Ndị na-ebuso m iro akọchawo m nke ukwuu nke na ọ dị ka à ga-asị na e gwepịara ọkpụkpụ m,+Ka ha nọ na-asị m ogologo ụbọchị dum: “Olee ebe Chineke gị nọ?”+ Abụ Ọma 74:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 Chineke, ruo ole mgbe ka onye mmegide ga na-akọcha gị?+Onye iro ọ̀ ga na-elelị aha gị ruo mgbe ebighị ebi?+ Abụ Ọma 79:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 Anyị aghọworo ndị agbata obi anyị ihe nkọcha,+Ghọọkwara ndị gbara anyị gburugburu ihe ọchị na ihe ịkwa emo.+ Abụ Ọma 89:51 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 51 Jehova, biko, cheta otú ndị iro gị si na-akọcha nzọụkwụ nke onye i tere mmanụ,+Otú ha si na-akọcha nzọụkwụ ya.+ Ndị Rom 15:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 N’ihi na ọbụna Kraịst emeghị ihe masịrị onwe ya;+ kama dị nnọọ ka e dere, sị: “Nkọcha nke ndị na-akọcha gị adakwasịwo m.”+
11 Aghọwo m onye a na-akọcha+ n’anya ndị niile na-ebuso m iro,+Otú ahụkwa ka m dị n’anya ndị agbata obi m,+Abụkwa m onye ndị mụ na ha ma na-atụ ụjọ.+Mgbe ha hụrụ m n’èzí, ha na-agbara m ọsọ.+
10 Ndị na-ebuso m iro akọchawo m nke ukwuu nke na ọ dị ka à ga-asị na e gwepịara ọkpụkpụ m,+Ka ha nọ na-asị m ogologo ụbọchị dum: “Olee ebe Chineke gị nọ?”+
10 Chineke, ruo ole mgbe ka onye mmegide ga na-akọcha gị?+Onye iro ọ̀ ga na-elelị aha gị ruo mgbe ebighị ebi?+
4 Anyị aghọworo ndị agbata obi anyị ihe nkọcha,+Ghọọkwara ndị gbara anyị gburugburu ihe ọchị na ihe ịkwa emo.+
51 Jehova, biko, cheta otú ndị iro gị si na-akọcha nzọụkwụ nke onye i tere mmanụ,+Otú ha si na-akọcha nzọụkwụ ya.+
3 N’ihi na ọbụna Kraịst emeghị ihe masịrị onwe ya;+ kama dị nnọọ ka e dere, sị: “Nkọcha nke ndị na-akọcha gị adakwasịwo m.”+