7 Jehova kwukwara, sị: “N’ezie, ahụwo m ahụ́ a na-emekpa ndị m bụ́ ndị nọ n’Ijipt, anụwokwa m mkpu ákwá ha na-eti n’ihi ndị na-amanye ha ịrụ ọrụ; n’ihi na m maara nnọọ ihe mgbu ha na-enwe.+
61Mmụọ nke Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova dị n’ahụ́ m,+ n’ihi na Jehova etewo m mmanụ+ izi ndị dị umeala n’obi ozi ọma.+ O zitewo m ikechi ọnyá nke ndị e tiwara obi,+ ịkpọsara ndị a dọọrọ n’agha+ na a tọhapụwo ha, na imeghe anya ndị mkpọrọ;+