13 Mgbe ihe a dum dakwasịchara anyị maka omume ọjọọ+ anyị na ikpe ọmụma anyị dị ukwuu—n’ihi na gị onwe gị, bụ́ Chineke anyị, eleghị njehie anyị anya otú ọ jọruru njọ,+ i mewokwa ka ndị a fọdụrụ anyị ndụ+—
7 Ka onye ajọ omume hapụ ụzọ ya,+ ka onye ọjọọ kwụsị iche echiche ọjọọ ya.+ Ya laghachikwuru Jehova, bụ́ onye ga-emere ya ebere,+ ya laghachikwuru Chineke anyị, n’ihi na ọ ga-agbaghara ya mmehie ya n’ụzọ dị ukwuu.+