36 mgbe ahụ, gị onwe gị, nọrọ n’eluigwe nụrụ, gbagharakwa mmehie ndị ohu gị, ya bụ, mmehie nke ndị gị bụ́ Izrel, n’ihi na ị na-ezi+ ha ụzọ dị mma nke ha kwesịrị ije ije na ya;+ mee ka mmiri zoo+ n’ala gị nke i nyere ndị gị ka ọ bụrụ ihe nketa ha.
20 Jehova ga-enye unu nri n’ụdị ahụhụ, nyekwa unu mmiri n’ụdị mmegbu;+ n’agbanyeghị nke ahụ, Onye Ozizi Ukwu gị agakwaghị ezo onwe ya ezo, anya gị ga-aghọkwa anya na-ahụ Onye Ozizi Ukwu gị.+
27 Ma mmanụ ahụ o tere+ unu onwe unu dị n’ime unu, ọ dịghịkwa unu mkpa ka onye ọ bụla na-akụziri unu ihe;+ ma mmanụ ahụ o tere unu bụ eziokwu,+ ọ bụghị okwu ụgha, ọ na-akụzikwara unu ihe niile.+ Dị ka ọ kụziiri unu, unu na ya dịrị n’otu.+