Abụ Ọma 119:165 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 165 Ndị hụrụ iwu gị n’anya nwere udo dị ukwuu,+Ọ dịghịkwa ihe na-eme ka ha sụọ ngọngọ.+ Aịzaya 66:12 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 12 N’ihi na nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Lee, m ga-enye ya udo nke ga-adị ka osimiri,+ nyekwa ya ebube nke mba niile nke ga-adị ka iyi tojubigara ókè,+ unu ga-aṅụkwa ara.+ A ga-eku unu n’akụkụ, a ga-ekukwasị unu n’ikpere, na-adịda unu aka.+ Jeremaya 33:6 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 ‘Lee, m ga-eme ka ọ gbakee ma nwee ahụ́ ike;+ m ga-agwọkwa ha ma kpugheere ha udo na eziokwu dị ukwuu.+ Ndị Rom 5:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 Ya mere, ebe a kpọworo anyị ndị ezi omume n’ihi okwukwe,+ ka anyị na Chineke dịrị n’udo+ site n’aka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst,
12 N’ihi na nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Lee, m ga-enye ya udo nke ga-adị ka osimiri,+ nyekwa ya ebube nke mba niile nke ga-adị ka iyi tojubigara ókè,+ unu ga-aṅụkwa ara.+ A ga-eku unu n’akụkụ, a ga-ekukwasị unu n’ikpere, na-adịda unu aka.+
6 ‘Lee, m ga-eme ka ọ gbakee ma nwee ahụ́ ike;+ m ga-agwọkwa ha ma kpugheere ha udo na eziokwu dị ukwuu.+
5 Ya mere, ebe a kpọworo anyị ndị ezi omume n’ihi okwukwe,+ ka anyị na Chineke dịrị n’udo+ site n’aka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst,