14 “Ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na nwa gị mesịa jụọ gị,+ sị, ‘Gịnị ka ihe a pụtara?’ ị ga-asị ya, ‘Jehova ji ike aka ya kpọpụta anyị n’Ijipt,+ n’ụlọ ndị ohu.+
21 I wee jiri ihe ịrịba ama na ọrụ ebube+ na aka dị ike na ogwe aka ị gbatịrị agbatị na ihe na-eme ka a tụọ oké egwu+ si n’ala Ijipt+ kpọpụta ndị gị bụ́ Izrel.