6Jehova wee gwa Mozis, sị: “Ugbu a, ị ga-ahụ ihe m gaje ime Fero,+ n’ihi na ọ bụ aka dị ike ga-eme ka ọ hapụ ha ka ha laa, ọ bụkwa aka dị ike ga-eme ka ọ chụpụ ha n’ala ya.”+
8 N’ikpeazụ, Jehova ji aka dị ike+ na ogwe aka ọ gbatịrị agbatị+ na ihe na-eme ka a tụọ oké egwu+ na ihe ịrịba ama nakwa ọrụ ebube dị iche iche+ kpọpụta anyị n’Ijipt.
21 Oleekwa mba ọzọ n’ụwa nke dị ka ndị gị Izrel,+ bụ́ ndị ezi Chineke gara gbapụtara onwe ya ka ha bụrụ ndị ya,+ iji meere onwe gị aha site n’ịrụzu oké ihe+ na ihe dị egwu site n’ịchụpụ mba dị iche iche+ n’ihu ndị gị bụ́ ndị ị gbapụtara n’Ijipt?