7“Mgbe Jehova bụ́ Chineke gị ga-emesị kpọbata gị n’ala ahụ ị na-abanye inweta,+ ọ ga-ekpochapụ mba ndị nwere ụba mmadụ n’ihu gị,+ bụ́ ndị Het+ na ndị Gegash+ na ndị Amọraịt+ na ndị Kenan+ na ndị Perizaịt+ na ndị Haịvaịt+ na ndị Jibọs,+ mba asaa ndị nwere ụba mmadụ ma dị ike karịa gị.+
44 Jehova nyekwara ha ezumike+ gbaa gburugburu, dị ka ihe niile ọ ṅụụrụ ndị nna nna ha n’iyi si dị,+ ọ dịghịkwa otu n’ime ndị iro ha niile guzoro n’ihu ha.+ Jehova nyefere ndị iro ha niile n’aka ha.+
12 M wee zipụ nkụda mmụọ ka o butere unu ụzọ, o wee chụpụ ha n’ihu unu,+ ya bụ, ndị eze abụọ nke ndị Amọraịt, ọ bụghị site ná mma agha unu ma ọ bụ ụta unu.+