7 Mgbasa ịchịisi ya+ na udo ya ga-agbasa agaghị enwe ọgwụgwụ,+ n’elu ocheeze Devid+ nakwa n’alaeze ya iji mee ka o guzosie ike+ nakwa iji jiri ikpe ziri ezi+ na ezi omume+ mee ka ọ dịgide, malite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi. Ekworo Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-emezu ihe a.+
5 Ma otu n’ime ndị okenye ahụ sịrị m: “Kwụsị ịkwa ákwá. Lee! Ọdụm nke si n’ebo Juda,+ bụ́ mgbọrọgwụ+ Devid,+ emeriwo.+ Ya mere, o ruru eru imeghe akwụkwọ mpịakọta ahụ na ihe asaa a kara akara e ji mechie ya.”