2 Ndị Eze 6:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 Mgbe onye na-ejere onye nke ezi Chineke ozi+ biliri n’isi ụtụtụ pụta n’èzí, lee, ìgwè ndị agha ejiriwo ịnyịnya na ụgbọ agha gbaa obodo ahụ gburugburu. Onye na-ejere ya ozi sịrị ya ozugbo: “Ewoo, nna m ukwu!+ Gịnị ka anyị ga-eme?” Abụ Ọma 27:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 Ọ bụrụgodị na ndị agha amaa ụlọikwuu ibuso m agha,+Obi m agaghị atụ egwu.+Ọ bụrụgodị na e buso m agha,+M ka ga na-atụkwasị ya obi.+ Abụ Ọma 121:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 Jehova ga-eche gị nche ka ọdachi ọ bụla ghara ịdakwasị gị.+Ọ ga-eche mkpụrụ obi gị nche.+ Ndị Rom 8:31 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 31 Gịnịzi ka anyị ga-ekwu banyere ihe ndị a? Ọ bụrụ na Chineke nọnyeere anyị, ònye ga-emegide anyị?+
15 Mgbe onye na-ejere onye nke ezi Chineke ozi+ biliri n’isi ụtụtụ pụta n’èzí, lee, ìgwè ndị agha ejiriwo ịnyịnya na ụgbọ agha gbaa obodo ahụ gburugburu. Onye na-ejere ya ozi sịrị ya ozugbo: “Ewoo, nna m ukwu!+ Gịnị ka anyị ga-eme?”
3 Ọ bụrụgodị na ndị agha amaa ụlọikwuu ibuso m agha,+Obi m agaghị atụ egwu.+Ọ bụrụgodị na e buso m agha,+M ka ga na-atụkwasị ya obi.+