22 Ebe ọ bụ na unu ji okwu ụgha mee ka obi onye ezi omume nọrọ ná mwute,+ mgbe mụ onwe m na-emeghị ka o nwee ihe mgbu, ebe unu mekwara ka aka onye ajọ omume dị ike+ ka o wee ghara ịhapụ ụzọ ajọ omume ya ka e wee debe ya ndụ,+
8 Ma ndị ụjọ na ndị na-enweghị okwukwe+ na ndị rụrụ arụ n’ihi omume ha ruru unyi+ na ndị na-egbu ọchụ+ na ndị na-akwa iko+ na ndị na-eme mgbaasị na ndị na-ekpere arụsị+ na ndị ụgha niile,+ òkè ha ga-abụ n’ime ọdọ ahụ nke ji ọkụ+ na sọlfọ+ na-enwu. Nke a pụtara ọnwụ nke abụọ.”+