Ilu 11:24 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 24 E nwere onye na-ekesasị ihe ma ka na-aba ụba;+ e nwekwara onye dị aka ntagide, ma ọ na-akpata naanị ịnọ n’ụkọ.+ Ilu 21:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 Onye ọ bụla nke na-emechi ntị ya ka ọ ghara ịnụ ákwá mkpesa nke onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya,+ ya onwe ya ga-akpọ òkù ma a gaghị aza ya.+ Ilu 28:27 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 27 Onye na-enye onye dara ogbenye ihe agaghị anọ n’ụkọ,+ ma onye na-ewepụ anya ya ga-enweta ọtụtụ ọbụbụ ọnụ.+ Matiu 5:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme ebere,+ n’ihi na a ga-emere ha ebere. Matiu 10:41 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 41 Onye na-anabata onye amụma n’ihi na ọ bụ onye amụma ga-enweta ụgwọ ọrụ nke onye amụma,+ onye na-anabatakwa onye ezi omume n’ihi na ọ bụ onye ezi omume ga-enweta ụgwọ ọrụ nke onye ezi omume.+ Ndị Hibru 6:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 N’ihi na Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya,+ ebe unu jewooro ndị nsọ ozi+ ma ka na-eje ozi. Jems 2:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 N’ihi na a ga-ekpe onye na-adịghị eme ebere ikpe n’emereghị ya ebere.+ Ya mere, ebere na-emeri ikpe.
24 E nwere onye na-ekesasị ihe ma ka na-aba ụba;+ e nwekwara onye dị aka ntagide, ma ọ na-akpata naanị ịnọ n’ụkọ.+
13 Onye ọ bụla nke na-emechi ntị ya ka ọ ghara ịnụ ákwá mkpesa nke onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya,+ ya onwe ya ga-akpọ òkù ma a gaghị aza ya.+
27 Onye na-enye onye dara ogbenye ihe agaghị anọ n’ụkọ,+ ma onye na-ewepụ anya ya ga-enweta ọtụtụ ọbụbụ ọnụ.+
41 Onye na-anabata onye amụma n’ihi na ọ bụ onye amụma ga-enweta ụgwọ ọrụ nke onye amụma,+ onye na-anabatakwa onye ezi omume n’ihi na ọ bụ onye ezi omume ga-enweta ụgwọ ọrụ nke onye ezi omume.+
10 N’ihi na Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya,+ ebe unu jewooro ndị nsọ ozi+ ma ka na-eje ozi.
13 N’ihi na a ga-ekpe onye na-adịghị eme ebere ikpe n’emereghị ya ebere.+ Ya mere, ebere na-emeri ikpe.