Ilu 15:23 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 23 Mmadụ na-aṅụrị ọṅụ n’ihi ihe ọnụ ya zara,+ leekwa nnọọ ka okwu e kwuru n’oge ya si dị mma!+ Ilu 24:26 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 26 Onye na-asa okwu n’ụzọ kwụ ọtọ ga-esusu mmadụ ọnụ.+ Ekliziastis 12:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 Onye mkpọkọta gbara mbọ ịchọta okwu dị ụtọ+ na ide okwu ziri ezi bụ́ eziokwu.+ Aịzaya 50:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova enyewo m ire nke ndị a kụziiri ihe,+ ka m wee mata otú m ga-esi zaa onye ike gwụrụ okwu.+ Ọ na-akpọte m kwa ụtụtụ; ọ na-akpọte ntị m ịnụ ihe dị ka ndị a kụziiri ihe.+
4 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova enyewo m ire nke ndị a kụziiri ihe,+ ka m wee mata otú m ga-esi zaa onye ike gwụrụ okwu.+ Ọ na-akpọte m kwa ụtụtụ; ọ na-akpọte ntị m ịnụ ihe dị ka ndị a kụziiri ihe.+