15 N’otu ụbọchị ahụ ka ị ga-enye ya ụgwọ ọrụ ya,+ ị ga-ewere ya nye ya tupu anyanwụ adaa, n’ihi na ọ nọ ná nsogbu, ọ bụkwa ụgwọ ọrụ ya ka mkpụrụ obi ya chekwubere; ka o wee ghara itiku Jehova n’ihi gị,+ ọ ga-aghọkwara gị mmehie.+
8 Ọ bụrụ na ị hụ ebe a na-emegbu onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya, na ebe e ji aka ike na-ewepụ ikpe ziri ezi+ na ezi omume n’ógbè a na-achị achị, ya ejula gị anya,+ n’ihi na onye dị elu karịa onye ahụ dị elu+ na-ahụ ihe na-emenụ,+ e nwekwara ndị dị elu karịa ndị ahụ dị elu.