Job 34:21 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 21 N’ihi na anya ya na-ahụ ụzọ mmadụ,+Ọ na-ahụkwa nzọụkwụ ya niile. Abụ Ọma 11:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 Jehova nọ n’ụlọ nsọ ya.+Jehova—n’eluigwe ka ocheeze ya dị.+Anya ya na-ahụ, anya ya nke na-enwu gbaa na-enyocha+ ụmụ mmadụ. Abụ Ọma 66:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 O ji ike ya na-achị achị ruo mgbe ebighị ebi.+Anya ya dị n’ebe mba niile nọ.+Ka ndị isi ike ghara ibuli onwe ha elu.+ Sila. Ilu 5:21 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 21 N’ihi na ụzọ mmadụ dị n’ihu Jehova,+ ọ na-echebara ụzọ ya niile echiche.+ Jeremaya 16:17 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 17 N’ihi na anya m na-ahụ ụzọ ha niile. E zoghị ha ezo n’ihu m, e zopụghịkwa njehie ha n’anya m.+ Jeremaya 23:24 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 24 “Ka ọ̀ dị onye pụrụ izo n’ebe nzuzo, mụ onwe m ewee ghara ịhụ ya?”+ ka Jehova kwuru. “Ọ̀ bụ na mụ onwe m ejupụtaghị eluigwe na ụwa?”+ ka Jehova kwuru. Ndị Hibru 4:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 Ọ dịghịkwa ihe e kere eke nke na-apụtaghị ìhè n’anya ya,+ ma ihe niile gba ọtọ, gherekwa oghe n’anya onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ.+
4 Jehova nọ n’ụlọ nsọ ya.+Jehova—n’eluigwe ka ocheeze ya dị.+Anya ya na-ahụ, anya ya nke na-enwu gbaa na-enyocha+ ụmụ mmadụ.
7 O ji ike ya na-achị achị ruo mgbe ebighị ebi.+Anya ya dị n’ebe mba niile nọ.+Ka ndị isi ike ghara ibuli onwe ha elu.+ Sila.
24 “Ka ọ̀ dị onye pụrụ izo n’ebe nzuzo, mụ onwe m ewee ghara ịhụ ya?”+ ka Jehova kwuru. “Ọ̀ bụ na mụ onwe m ejupụtaghị eluigwe na ụwa?”+ ka Jehova kwuru.
13 Ọ dịghịkwa ihe e kere eke nke na-apụtaghị ìhè n’anya ya,+ ma ihe niile gba ọtọ, gherekwa oghe n’anya onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ.+