1 Samuel 15:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 E mesịa, Samuel bịakwutere Sọl. Sọl wee malite ịsị ya: “Onye Jehova gọziri agọzi+ ka ị bụ. Emewo m ihe Jehova kwuru.”+ Abụ Ọma 36:2 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 2 N’ihi na, n’anya ya, ọ dị akọ nke ukwuu+Nke na ọ gaghị achọpụta njehie ya ka o wee kpọ ya asị.+ Ilu 21:2 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 2 Ụzọ niile nke mmadụ ziri ezi n’anya ya,+ ma Jehova na-enyocha obi.+ Ilu 30:12 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 12 E nwere ọgbọ nke dị ọcha n’anya onwe ya,+ ma a sachapụbeghị nsị ya n’ahụ́ ya.+ Jeremaya 17:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 “Obi dị aghụghọ karịa ihe ọ bụla ọzọ, o sikwara ike njite.+ Ònye pụrụ ịmara ya? Luk 18:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 Onye Farisii ahụ guzoro ọtọ+ wee malite ikpe ekpere+ n’obi ya, sị, ‘Chineke, ana m ekele gị na adịghị m ka ụmụ mmadụ ndị ọzọ, bụ́ ndị na-apụnara mmadụ ihe, ndị ajọ omume, ndị na-akwa iko ma ọ bụ ọbụna dị ka onye ọnaụtụ a.+
13 E mesịa, Samuel bịakwutere Sọl. Sọl wee malite ịsị ya: “Onye Jehova gọziri agọzi+ ka ị bụ. Emewo m ihe Jehova kwuru.”+
11 Onye Farisii ahụ guzoro ọtọ+ wee malite ikpe ekpere+ n’obi ya, sị, ‘Chineke, ana m ekele gị na adịghị m ka ụmụ mmadụ ndị ọzọ, bụ́ ndị na-apụnara mmadụ ihe, ndị ajọ omume, ndị na-akwa iko ma ọ bụ ọbụna dị ka onye ọnaụtụ a.+