16 Ọ sịrị nwaanyị ahụ: “M ga-eme ka ihe mgbu nke afọ ime gị+ mụbaa nke ukwuu; ime ga-eme gị mgbe ị ga-amụ ụmụ,+ ị ga na-enwe agụụ maka di gị, ọ ga-achịkwa gị.”+
14 Ha wee na-eme ka ndụ na-elu ha ilu site n’ime ka ha na-arụgbu onwe ha n’ọrụ n’ịkpụ ájá ụrọ+ na brik, nakwa ịrụgbu onwe ha n’ọrụ n’ụdị ọrụ ọ bụla a na-arụ n’ubi,+ ee, n’ụdị ọrụ ọ bụla ha ji ọchịchị aka ike mee ka ha na-arụrụ ha dị ka ndị ohu.+
3 Aka ha dị n’ihe ọjọọ, imeta ya nke ọma;+ onyeisi na-ekwu ka e nye ya ihe, onye na-ekpe ikpe na-ekpekwa ikpe iji nata ụgwọ ọrụ,+ onye ukwu na-ekwukwa ihe si ya n’obi, uche nke aka ya;+ ha na-agbakọ aka eme ya.