Ọnụ Ọgụgụ 32:23 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 23 Ma ọ bụrụ na unu emeghị otú a, unu emehiewo Jehova.+ Mgbe ahụ, maranụ na unu ga-ata ahụhụ mmehie unu.+ Job 18:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 A ga-emekwa ka ìhè ndị ajọ omume nyụọ ka ọkụ,+Ikerike ọkụ ya agaghịkwa enwu. Abụ Ọma 11:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 Jehova na-enyocha ma onye ezi omume ma onye ajọ omume,+Mkpụrụ obi ya kpọrọ onye ọ bụla nke hụrụ ime ihe ike n’anya asị.+ Abụ Ọma 37:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 N’oge na-adịghị anya, onye ajọ omume agakwaghị anọ;+Ị ga-elekwa anya n’ebe ọ na-anọ, ma ọ gaghị anọ ya.+ Aịzaya 57:21 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 21 Udo adịghịrị ndị ajọ omume,”+ ka Chineke m kwuru. Matiu 25:46 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 46 Ndị a ga-anwụ ọnwụ ebighị ebi,+ ma ndị ezi omume ga-enweta ndụ ebighị ebi.”+ 2 Pita 2:12 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 12 Ma, a ga-ebibi ndị a dị ka anụmanụ ndị na-adịghị eche echiche, bụ́ ndị a na-amụ ka e jide ha gbuo, n’ihe ndị ahụ ha na-amaghị ma na-ekwujọ,+ n’ụzọ mbibi nke ha na-eso,
23 Ma ọ bụrụ na unu emeghị otú a, unu emehiewo Jehova.+ Mgbe ahụ, maranụ na unu ga-ata ahụhụ mmehie unu.+
5 Jehova na-enyocha ma onye ezi omume ma onye ajọ omume,+Mkpụrụ obi ya kpọrọ onye ọ bụla nke hụrụ ime ihe ike n’anya asị.+
10 N’oge na-adịghị anya, onye ajọ omume agakwaghị anọ;+Ị ga-elekwa anya n’ebe ọ na-anọ, ma ọ gaghị anọ ya.+
12 Ma, a ga-ebibi ndị a dị ka anụmanụ ndị na-adịghị eche echiche, bụ́ ndị a na-amụ ka e jide ha gbuo, n’ihe ndị ahụ ha na-amaghị ma na-ekwujọ,+ n’ụzọ mbibi nke ha na-eso,