4 Sekpụrụ m n’aka;+ ka anyị gbapụ. Eze akpọbatawo m n’ime ime ụlọ ya!+ Ka anyị ṅụrịa ọṅụ, meekwa onwe anyị obi ụtọ. Ka anyị kwuo banyere otú i si egosi ịhụnanya karịa ka anyị na-ekwu banyere mmanya.+ O kwesịrị nnọọ ekwesị na ha hụrụ gị n’anya.+
10 Lee ka otú i si egosi ịhụnanya gị si dị mma,+ nwanne m nwaanyị, nwaanyị m na-alụ ọhụrụ! Lee ka otú i si egosi ịhụnanya si dị ụtọ karịa mmanya, ísì mmanụ gị dịkwa ụtọ karịa ụdị ihe otite niile na-esi ísì ụtọ!+