10 Mee ka obi ndị a ghara ịnabata ihe,+ meekwa ka ntị ha kpọchie akpọchie,+ nyachiekwa anya ha, ka ha wee ghara iji anya ha hụ ụzọ, gharakwa iji ntị ha nụ ihe, ka obi ha gharakwa ịghọta ihe, ka ha wee ghara ichegharị, e wee gwọọ ha.”+
27 N’ihi na obi nke ndị a adịkwaghị anabata ihe, ha ejiriwokwa ntị ha nụ ihe ma ha emeghị ihe ọ bụla, ha emechiwokwa anya ha; ka ha wee ghara iji anya ha hụ ụzọ, gharakwa iji ntị ha nụ ihe ma jiri obi ha ghọta ihe wee chigharịa, ka m wee gwọọ ha.”’+
8 dị nnọọ ka e dere, sị: “Chineke enyewo ha mmụọ nke oké ụra,+ nyekwa ha anya ka ha wee ghara ịhụ ụzọ, nyekwa ha ntị ka ha wee ghara ịnụ ihe, ruo taa.”+