27 N’ihi na mụ onwe m maara nke ọma banyere nnupụisi+ gị na ikwesi olu ike gị.+ Ọ bụrụ na mgbe m ka nọ ndụ ma nọrọ n’etiti unu taa, unu anọwo na-enupụrụ Jehova isi site n’àgwà unu na-akpaso ya,+ lezienụ ihe ga-eme mgbe m nwụsịrị!
4 Ahụhụ ga-adịrị mba nke na-eme mmehie,+ ndị njehie na-anyịgbu, mkpụrụ nke na-eme ihe ọjọọ,+ ụmụ na-eweta mbibi!+ Ha ahapụwo Jehova,+ ha elelịwokwa Onye Nsọ Izrel,+ ha alaghachiwo azụ.+
3 Ọ bụ n’ihi ihe ọjọọ ha mere iji kpasuo m iwe site n’ịga na-esurere chi ọzọ dị iche iche ihe nsure ọkụ+ ma na-efe ha ofufe, bụ́ chi dị iche iche ha onwe ha na unu onwe unu na nna nna unu hà na-amaghị.+
51 “Ndị na-ekwesi olu ike na ndị a na-ebighị úgwù n’obi+ na ná ntị, unu na-eguzogide mmụọ nsọ mgbe niile; dị ka nna nna unu hà mere, otú ahụ ka unu na-eme.+