31Ahụhụ ga-adịrị ndị na-agbada Ijipt ịga chọọ enyemaka,+ ndị na-adabere n’ịnyịnya efu,+ ndị na-atụkwasị obi n’ụgbọ ịnyịnya agha+ n’ihi na ha dị ọtụtụ, ndị na-atụkwasịkwa obi n’ịnyịnya agha n’ihi na ha dị ike nke ukwuu, ma ha elekwasịghị Onye Nsọ Izrel anya, ha achọghịkwa Jehova.+
3 Otú ọ dị, ndị Ijipt bụ mmadụ,+ ha abụghị Chineke; ịnyịnya ha bụkwa anụ ahụ́,+ ha abụghị mmụọ. Jehova ga-esetịkwa aka ya, onye na-enye aka ga-asụ ngọngọ, onye a na-enyere aka ga-adakwa,+ ha niile ga-ala n’iyi n’otu mgbe.