11Ndị isi+ ụmụ Izrel wee biri na Jeruselem;+ ma ndị ọzọ fere nza+ ịkpọta otu onye n’ime mmadụ iri ọ bụla ka o biri na Jeruselem bụ́ obodo nsọ,+ mmadụ itoolu fọdụrụnụ ebirikwa n’obodo ndị ọzọ.
28 Onye na-ekwu banyere Saịrọs,+ sị, ‘Ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ m, ọ ga-eme ihe niile na-atọ m ụtọ;+ ọ ga-eme ọbụna ihe m kwuru banyere Jeruselem, sị, ‘A ga-ewughachi ya,’ na ihe m kwuru banyere ụlọ nsọ ya, sị, ‘A ga-atọ ntọala gị.’”+