11Ndị Izrel wee mewe dị ka ndị nwere ihe ọjọọ ha ga-eme mkpesa ya ná ntị Jehova.+ Mgbe Jehova nụrụ ya, o were iwe dị ọkụ, ọkụ nke Jehova wee malite ire ha, o wee regbuo ụfọdụ ndị ná nsọtụ ebe ha mara ụlọikwuu.+
25 Ọ bụ ya mere Jehova ji na-eweso ndị ya iwe dị ọkụ, ọ ga-esetịkwa aka ya mee ha ihe wee gbuo ha.+ Ugwu ga-ama jijiji,+ ozu ha ga-adịkwa ka ihe e kpofuru ekpofu n’etiti okporo ámá.+
N’ihi ihe a dum, iwe ya adajụbeghị, kama aka ya ka setịrị esetị.
2 Jehova bụ Chineke nke chọrọ ofufe a na-ekewaghị ekewa,+ bụrụkwa onye na-abọ ọbọ; Jehova na-abọ ọbọ,+ na-ewekwa iwe.+ Jehova ga-abọ ọbọ n’ahụ́ ndị iro+ ya, ọ na-eweso ndị iro+ ya iwe.