Ọnụ Ọgụgụ 23:22 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 22 Chineke si n’Ijipt na-akpọpụta ha.+Ịwụ ọsọ ya dị ka nke atụ́.+ Diuterọnọmi 33:17 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 17 Ịma mma ya dị ka nke oké ehi e bu ụzọ mụọ,+Mpi ya bụkwa mpi atụ́.+Ọ ga-eji ha na-asọ ndị dị iche iche,+Sọrọ ha niile ruo na nsọtụ ụwa,Ha bụkwa iri puku kwuru iri puku nke Ifrem,+Ha bụkwa puku kwuru puku nke Manase.” Job 39:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 Atụ́ ọ̀ ga-achọ ijere gị ozi,+Ka ọ̀ ga-anọbọ chi n’akụkụ ihe i ji etinyere anụ ụlọ nri? Abụ Ọma 92:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 Ma ị ga-eme ka mpi m dị elu dị ka nke atụ́;+M ga-ete mmanụ ọhụrụ.+
17 Ịma mma ya dị ka nke oké ehi e bu ụzọ mụọ,+Mpi ya bụkwa mpi atụ́.+Ọ ga-eji ha na-asọ ndị dị iche iche,+Sọrọ ha niile ruo na nsọtụ ụwa,Ha bụkwa iri puku kwuru iri puku nke Ifrem,+Ha bụkwa puku kwuru puku nke Manase.”