30 Gee ntị n’arịrịọ ohu gị na-arịọ ka i meere ya amara+ nakwa nke ndị gị Izrel chere ihu n’ebe a na-arịọ; gị onwe gị nọrọkwa n’ebe obibi gị n’eluigwe nụrụ,+ nụrụ ya ma gbaghara.+
6 Ma, gị onwe gị, mgbe ị na-ekpe ekpere, banye n’ọnụ ụlọ gị,+ mgbe i mechisịrị ọnụ ụzọ gị, kpekuo Nna gị nke nọ na nzuzo ekpere;+ Nna gị nke na-ahụ ihe na nzuzo ga-akwụ gị ụgwọ.