19 N’ihi na amarawo m ya ka o wee nye ụmụ ya nakwa ezinụlọ ya ga-anọchi ya iwu ka ha debe ụzọ Jehova iji na-eme ezi omume ma na-eme ihe n’ikpe ziri ezi;+ ka Jehova wee mezuoro Ebreham ihe o kwuru banyere ya.”+
9 “Naanị lezie anya, cheekwa mkpụrụ obi gị nche nke ọma,+ ka i wee ghara ichefu ihe ndị anya gị hụworo,+ ka ha gharakwa ịpụ n’obi gị n’ụbọchị niile nke ndụ gị;+ meekwa ka ụmụ gị na ụmụ ụmụ gị mara ha,+