9 Ndị niile na-eme ihe oyiyi a pịrị apị bụ ihe efu,+ ihe ndị ahụ ha hụrụ n’anya agaghịkwa aba uru ọ bụla.+ Dịkwa ka ndị àmà ha, ha adịghị ahụ ihe ọ bụla, ha amaghịkwa ihe ọ bụla,+ ka ihere wee mee ndị na-eme ha.+
5 Ha dị ka ihe e ji achụ anụmanụ n’ubi kukumba, ha apụghị ikwu okwu.+ A na-ebu ha ebu, n’ihi na ha apụghị ịga ije.+ Atụla egwu n’ihi ha, n’ihi na ha apụghị iweta ọdachi ọ bụla, ha adịghịkwa eme ihe ọma ọ bụla.”+
18 Olee uru ihe oyiyi a pịrị apị+ na ihe oyiyi a wụrụ awụ na onye na-ezi ozizi ụgha+ bara nke mere onye rụrụ ya ji rụọ ya, nke mere o ji tụkwasị ya obi,+ o wee mee chi na-abaghị uru, bụ́ ndị na-adịghị ekwu okwu?+