61Mmụọ nke Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova dị n’ahụ́ m,+ n’ihi na Jehova etewo m mmanụ+ izi ndị dị umeala n’obi ozi ọma.+ O zitewo m ikechi ọnyá nke ndị e tiwara obi,+ ịkpọsara ndị a dọọrọ n’agha+ na a tọhapụwo ha, na imeghe anya ndị mkpọrọ;+
16 Mgbe e mesịrị Jizọs baptizim, o si na mmiri ahụ bilie ozugbo; ma, lee! eluigwe meghere,+ o wee hụ ka mmụọ Chineke na-efedata dị ka nduru+ wee bekwasị ya.+
38 ya bụ, Jizọs onye Nazaret, otú Chineke si jiri mmụọ nsọ+ na ike tee ya mmanụ, o wee gazuo ala ahụ na-eme ihe ọma ma na-agwọ ndị niile Ekwensu na-emekpọ ọnụ;+ n’ihi na Chineke nọnyeere ya.+