17 Ọ sịkwara Adam: “Ebe ọ bụ na i gere ntị n’olu nwunye gị wee rie mkpụrụ si n’osisi ahụ nke m nyere gị iwu a banyere ya,+ sị, ‘Erila mkpụrụ si na ya,’ ihe a bụrụ ọnụ ka ala bụ n’ihi gị.+ N’ụbọchị niile nke ndụ gị,+ ị ga-enwe ihe mgbu tupu gị erie ihe ọ na-emepụta.
12 N’ihi ya, dị nnọọ ka mmehie si n’aka otu mmadụ+ bata n’ụwa, ọnwụ+ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere+—.