6 “Ya mere, gwa ụmụ Izrel, sị, ‘Abụ m Jehova, m ga-akpọpụta unu n’ibu arọ ndị Ijipt, napụtakwa unu n’ohu unu na-agbara ha,+ n’ezie, m ga-eji ogwe aka a gbatịrị agbatị na oké ikpe gbapụta unu.+
17 Nke a bụ ihe Jehova, Onye Mgbapụta gị,+ bụ́ Onye Nsọ Izrel,+ kwuru: “Mụ onwe m, Jehova, bụ Chineke gị, Onye na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru,+ Onye na-eme ka i jee ije n’ụzọ i kwesịrị iso.+
34 Onye Mgbapụta ha dị ike,+ aha ya bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha.+ Ọ ghaghị ikpechite ọnụ ha,+ ka o wee mee ka ala ha zuru ike,+ meekwa ka ndị bi na Babịlọn maa jijiji.”+