16 ka unu wee ghara ime omume na-eweta mbibi,+ gharakwa imere onwe unu ihe oyiyi a pịrị apị, ọdịdị nke ihe oyiyi ọ bụla, ihe yiri nwoke ma ọ bụ nwaanyị,+
28 N’ebe ahụ, unu ga-efe chi dị iche iche,+ bụ́ ndị aka mmadụ mere, osisi na nkume,+ ndị na-apụghị ịhụ ụzọ ma ọ bụ ịnụ ihe ma ọ bụ iri ihe ma ọ bụ ịnụ ísì.+
29 “Ya mere, ebe ọ bụ na anyị bụ ndị Chineke mụrụ,+ anyị ekwesịghị iche na Chineke+ yiri ọlaedo ma ọ bụ ọlaọcha ma ọ bụ nkume, dị ka ihe a kpụrụ akpụ site na nkà na nchepụta nke mmadụ.+
23 wee gbanwee ebube+ nke Chineke onye na-apụghị ire ure ka ọ bụrụ ihe yiri onyinyo+ nke mmadụ pụrụ ire ure na nke nnụnụ na anụ ndị nwere ụkwụ anọ na ihe ndị na-akpụ akpụ.+