3 Ọ ga-anọdụkwa dị ka onye na-anụcha ihe na onye na-eme ka ọlaọcha dị ọcha,+ ọ ga-emekwa ka ụmụ Livaị dị ọcha;+ ọ ga-anụcha ha dị ka ọlaedo,+ nụchaakwa ha dị ka ọlaọcha, ha ga-aghọkwara Jehova ndị na-eweta onyinye inweta ihu ọma+ n’ezi omume.
11 N’eziokwu, ọ dịghị ịdọ aka ná ntị ọ bụla nke na-eyi ihe na-enye ọṅụ mgbe a na-adọ ya, kama ọ na-eyi ihe mwute;+ ma n’ikpeazụ, ọ na-amịrị ndị e ji ya zụọ mkpụrụ udo,+ ya bụ, ezi omume.+