3 N’ihi na Jehova ga-akasi Zayọn obi.+ Ọ ga-akasikwa ebe ya niile tọgbọrọ n’efu obi,+ ọ ga-eme ka ala ịkpa ya dị ka Iden,+ meekwa ka mbara ọzara ya dị ka ubi Jehova.+ Obi ụtọ na ọṅụ ga-adị n’ime ya, a ga na-anụkwa ekele na abụ olu ụtọ n’ime ya.+
18 Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Lee, m ga-achịkọta ndị e si n’ụlọikwuu Jekọb dọrọ n’agha,+ m ga-enwere ụlọikwuu ya dị nsọ ọmịiko. A ga-ewughachi obodo ya ná mkputamkpu ala ya;+ ụlọ elu ya ga-adịkwa n’ebe o kwesịrị ịdị.+