9 N’ihi na agwaetiti niile ga na-enwe olileanya n’ebe m nọ,+ ụgbọ mmiri Tashish+ ga na-enwekwa olileanya dị ka ha na-enwebu, iji si n’ebe dị anya bulata ụmụ gị,+ bulata ha na ọlaọcha ha na ọlaedo ha,+ n’ihi aha+ Jehova bụ́ Chineke gị na Onye Nsọ Izrel,+ n’ihi na ọ ga-achọworị gị mma.+