20 “‘N’ihi na m kụrisịrị yok gị mgbe dị anya gara aga;+ m dọbisịrị agbụ e kere gị. Ma ị sịrị: “Agaghị m ejere gị ozi,” n’ihi na ọ bụ n’ugwu ọ bụla dị elu nakwa n’okpuru osisi ọ bụla jupụtara n’akwụkwọ ndụ+ ka ị na-edina jaghee ụkwụ+ gị wee na-agba akwụna.+
16 I wee chịrị ụfọdụ n’ime uwe gị meere onwe gị ebe dị elu+ ndị tụrụ àgwà, na-agbakwa akwụna n’elu ha,+ ụdị ihe ndị ahụ ekwesịghị ịdị, ha ekwesịghịkwa ime.
17 Ụmụ Babịlọn wee na-abịakwute ya n’ihe ndina ọ na-anọ egosi ịhụnanya, jiri mmekọahụ ha rụrụ arụ na-emerụ ya;+ ha wee na-emerụ ya, mkpụrụ obi ya wee hapụ ha n’iwe.