Levitikọs 26:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu, onye kpọpụtara unu n’ala Ijipt ka unu kwụsị ịgbara ha ohu,+ m wee gbajie osisi yok unu ma mee ka unu guzoro kwem na-eje ije.+ Diuterọnọmi 4:20 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 20 Kama ọ bụ unu ka Jehova kpọọrọ ka ọ kpọpụta unu n’oké ọkụ e ji agbaze ígwè,+ n’Ijipt, ka unu bụrụ otu ndị ọ bụ naanị ya nwe+ dị ka ọ dị taa. Aịzaya 9:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 N’ihi na, dị ka i mere n’ụbọchị Midian,+ ị kụjisịwo yok ha ji ebu ibu+ na mkpanaka nke dị n’ubu ha, bụ́ mkpara nke onye na-amanye ha ịrụ ọrụ.+ Nehọm 1:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 M ga-agbaji osisi o ji ebu ihe nke dị n’ubu gị,+ ọ bụkwa agbụ e kere gị ka m ga-adọbi abụọ.+
13 Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu, onye kpọpụtara unu n’ala Ijipt ka unu kwụsị ịgbara ha ohu,+ m wee gbajie osisi yok unu ma mee ka unu guzoro kwem na-eje ije.+
20 Kama ọ bụ unu ka Jehova kpọọrọ ka ọ kpọpụta unu n’oké ọkụ e ji agbaze ígwè,+ n’Ijipt, ka unu bụrụ otu ndị ọ bụ naanị ya nwe+ dị ka ọ dị taa.
4 N’ihi na, dị ka i mere n’ụbọchị Midian,+ ị kụjisịwo yok ha ji ebu ibu+ na mkpanaka nke dị n’ubu ha, bụ́ mkpara nke onye na-amanye ha ịrụ ọrụ.+