Aịzaya 14:25 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 25 iji gbajie onye Asiria n’ala m,+ ka m wee zọda ya n’ugwu m;+ ka yok ya wee pụọ n’ahụ́ ndị m, ka ibu ya wee pụọkwa n’ubu ha.”+ Jeremaya 30:8 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 8 “Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ,” ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, “na m ga-agbaji yok ahụ ha nya n’olu, m ga-adọbikwa agbụ ha ụzọ abụọ,+ ndị ala ọzọ agakwaghị erigbu ha dị ka ohu. Hosia 11:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 M ji ụdọ ụmụ mmadụ na-adọ ha, bụ́ ụdọ ịhụnanya,+ m wee dịrị ha ka ndị na-ekopụ yok n’agba ha,+ m jikwa nwayọọ wetara onye nke ọ bụla ihe oriri.+
25 iji gbajie onye Asiria n’ala m,+ ka m wee zọda ya n’ugwu m;+ ka yok ya wee pụọ n’ahụ́ ndị m, ka ibu ya wee pụọkwa n’ubu ha.”+
8 “Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ,” ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, “na m ga-agbaji yok ahụ ha nya n’olu, m ga-adọbikwa agbụ ha ụzọ abụọ,+ ndị ala ọzọ agakwaghị erigbu ha dị ka ohu.
4 M ji ụdọ ụmụ mmadụ na-adọ ha, bụ́ ụdọ ịhụnanya,+ m wee dịrị ha ka ndị na-ekopụ yok n’agba ha,+ m jikwa nwayọọ wetara onye nke ọ bụla ihe oriri.+