13 “Tinyenụ mma owuwe ihe ubi,+ n’ihi na ihe ubi achawo.+ Bịanụ, gbadatanụ, n’ihi na ebe nzọchapụta mmanya ejuwo.+ Olulu ịzọchapụta mmanya ejubigawo ókè; n’ihi na ihe ọjọọ ha adịwo ukwuu.+
20 E wee zọchaa mkpụrụ vaịn ahụ n’ebe nzọchapụta mmanya nke dị n’azụ obodo,+ ọbara wee si n’ebe nzọchapụta mmanya ahụ na-asọpụta, tookwa ruo n’eriri e kere ịnyịnya n’olu,+ ruo ebe dị otu puku na narị fọlọng isii.*+
15 Ogologo mma agha dị nkọ sikwa n’ọnụ ya pụta,+ ka o jiri ya gbuo mba niile, ọ ga-ejikwa mkpanaka ígwè zụọ ha dị ka atụrụ.+ Ọ na-azọchakwa mkpụrụ dị n’ebe nzọchapụta mmanya+ nke iwe nke ọnụma Chineke,+ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.