13 Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Lee! Ndị ohu m ga-eri ihe,+ ma agụụ ga na-agụ unu.+ Lee! Ndị ohu m ga-aṅụ ihe ọṅụṅụ,+ ma akpịrị ga na-akpọ unu nkụ.+ Lee! Ndị ohu m ga-aṅụrị ọṅụ,+ ma ihere ga na-eme unu.+
13 Jehova, olileanya Izrel,+ ihere ga-eme ndị niile hapụrụ gị.+ Ndị si n’ife m ofufe dapụ,+ a ga-ede aha ha n’ájá, n’ihi na ha ahapụwo isi iyi nke mmiri na-enye ndụ, bụ́ Jehova.+
18 Ka ihere mee ndị na-akpagbu m,+ ma ekwela ka ihere mee m.+ Ka ọ bụrụ ha ka ụjọ ga-ejide, ma ekwela ka ụjọ jide m. Mee ka ụbọchị ọdachi bịakwasị ha,+ mee ka ọkpụkpụ ha gbajisịa ọbụna okpukpu abụọ.+