13 “Ifrem wee hụ ọrịa ọ na-arịa, Juda hụkwara ọnyá ya.+ Ifrem wee gaa Asiria+ zigara eze ukwu+ ndị ozi. Ma onye ahụ agwọlighị unu,+ ọ pụghịkwa ime ka ọnyá unu laa.+
3 Asiria agaghị azọpụta anyị.+ Anyị agaghị agba ịnyịnya.+ Anyị agaghị asị aka ọrụ anyị ọzọ, “Ị bụ Chineke anyị!” n’ihi na ọ bụ gị na-eme ka e meere nwa na-enweghị nna ebere.’+