21 Jehova wee ziga otu mmụọ ozi+ wee kpochapụ ndị dimkpa bụ́ dike+ na ndị ndú na ndị isi niile n’ebe eze Asiria mara ụlọikwuu,+ nke mere na o ji ihere laghachi n’ala ya. E mesịa, ọ banyere n’ụlọ chi ya, ụfọdụ n’ime ụmụ ya wee were mma agha gbuo ya n’ebe ahụ.+
36 Mmụọ ozi+ Jehova wee gaa gbuo otu narị puku na iri puku mmadụ asatọ na puku ise n’ebe ndị Asiria mara ụlọikwuu.+ Mgbe ndị mmadụ biliri n’isi ụtụtụ, lee, ha niile bụ ozu ozu.+
10 Onye iro m ga-ahụ ya, ihere ga-emegbukwa ya,+ bụ́ onye nọ na-ajụ m, sị: “Olee ebe Jehova bụ́ Chineke gị nọ?”+ M ga na-ele onye iro m anya.+ Ọ ga-aghọ ebe a ga na-azọtọ azọtọ, dị ka apịtị dị n’okporo ámá.+
7 Ọ ga-erukwa na onye ọ bụla hụrụ gị ga-agbara gị ọsọ,+ ọ ga-asịkwa, ‘E bibiwo Ninive! Ònye ga-emetara ya ebere?’ Ebee ka m ga-achọta ndị ga-akasi gị obi?